Zekaraya 10

Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị, ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Zechariah 10:12 (UKJV) And I will strengthen them in the LORD; and they shall walk up and down in his name, says the LORD.

10Aga m esi nʼala Ijipt kpọlata ha, sitekwa nʼAsịrịa chịkọtaa ha. Aga m akpọta ha na Gilead na Lebanọn. Ha agaghị enwekwa ebe ga-ezuru ha niile.

11Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee. A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ. Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa. A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa, wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt.

12Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị, ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.