Zekaraya 11

Mgbe ahụ, eweere m mkpanaka m, nke a kpọrọ Amara gbajie ya abụọ, igosi na emebiela m ọgbụgba ndụ nke mụ na ndị mmadụ gbara.

Zechariah 11:10 (UKJV) And I took my staff, even Beauty, and cut it asunder, that I might break my covenant which I had made with all the people.

8Nʼime otu ọnwa, ewezugara m ndị ọzụzụ atụrụ atọ. Igwe ewu na atụrụ ndị ahụ kpọkwazịrị m asị, enwezighị m ike nweere ha ndidi.

9Nʼihi ya, ekwuru m si, “Agaghị m abụkwa onye ọzụzụ atụrụ unu ọzọ. Nke ọbụla na-anwụ, ya nwụọ, ọzọ, nke na-ala nʼiyi, ya laa nʼiyi. Ka ndị fọdụrụ rie anụ ahụ ibe ha.”

10Mgbe ahụ, eweere m mkpanaka m, nke a kpọrọ Amara gbajie ya abụọ, igosi na emebiela m ọgbụgba ndụ nke mụ na ndị mmadụ gbara.

11Nʼụbọchị ahụ ka e mere ka ọgbụgba ndụ ahụ gharakwa ịdị. Mgbe ahụ, ndị ahụ a na-akpagbu nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, bụ ndị na-ele m anya matara na ọ bụ okwu Onyenwe anyị.

12Mgbe ahụ, agwara m ha, “Ọ bụrụ na ọ masịrị unu, unu kwụọ m ụgwọ ọrụ m, ọ bụrụkwa na ọ masịghị unu, deberenụ onwe unu ego unu.” Nʼihi nke a, ha gụpụtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, jiri ya kwụọ m ụgwọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.