Zekaraya 11

Nʼihi ya, ekwuru m si, “Agaghị m abụkwa onye ọzụzụ atụrụ unu ọzọ. Nke ọbụla na-anwụ, ya nwụọ, ọzọ, nke na-ala nʼiyi, ya laa nʼiyi. Ka ndị fọdụrụ rie anụ ahụ ibe ha.”

Zechariah 11:9 (UKJV) Then said I, I will not feed you: that that dies, let it die; and that that is to be cut off, let it be cut off; and let the rest eat every one the flesh of another.

7Nʼihi ya, azụrụ m igwe ewu na atụrụ ndị ahụ a ga-egbu egbu, nke ka nke, ndị ahụ a na-emegbu emegbu. Eweere m mkpanaka abụọ, kpọọ otu nʼime ha Amara, kpọọ nke ọzọ Ịdị nʼotu. Azụkwara m igwe atụrụ ndị ahụ.

8Nʼime otu ọnwa, ewezugara m ndị ọzụzụ atụrụ atọ. Igwe ewu na atụrụ ndị ahụ kpọkwazịrị m asị, enwezighị m ike nweere ha ndidi.

9Nʼihi ya, ekwuru m si, “Agaghị m abụkwa onye ọzụzụ atụrụ unu ọzọ. Nke ọbụla na-anwụ, ya nwụọ, ọzọ, nke na-ala nʼiyi, ya laa nʼiyi. Ka ndị fọdụrụ rie anụ ahụ ibe ha.”

10Mgbe ahụ, eweere m mkpanaka m, nke a kpọrọ Amara gbajie ya abụọ, igosi na emebiela m ọgbụgba ndụ nke mụ na ndị mmadụ gbara.

11Nʼụbọchị ahụ ka e mere ka ọgbụgba ndụ ahụ gharakwa ịdị. Mgbe ahụ, ndị ahụ a na-akpagbu nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, bụ ndị na-ele m anya matara na ọ bụ okwu Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.