1Lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, mgbe a ga-ekesa ihe nkwata gị niile nʼetiti mgbidi gị.
2Aga m achịkọta mba niile ka ha bịa Jerusalem ibuso ya agha. Ha ga-adọta obodo ahụ nʼagha, tụtụkọọ ihe dị nʼụlọ niile, dinaa ndị inyom nʼike. A ga-adọta ọkara ndị bi nʼobodo ahụ nʼagha, duru ha gaa mba ọzọ. Ma ọkara nke ọzọ ka ha ga-ahapụ.
3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-apụ ibuso ndị mba ọzọ ahụ agha, dịka o si ebu agha nʼụbọchị agha.
4Nʼụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo nʼelu Ugwu Oliv, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem. Mgbe ahụ, Ugwu Oliv ga-ekewa abụọ, mee ka ndagwurugwu buru ibu dịrị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Nʼihi ya, ugwu ahụ ga-eke onwe ya abụọ. Otu akụkụ ga-adị nʼugwu, nke ọzọ ga-adị nʼụzọ ndịda.