Zekaraya 14

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-apụ ibuso ndị mba ọzọ ahụ agha, dịka o si ebu agha nʼụbọchị agha.

Zechariah 14:3 (UKJV) Then shall the LORD go forth, and fight against those nations, as when he fought in the day of battle.

1Lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, mgbe a ga-ekesa ihe nkwata gị niile nʼetiti mgbidi gị.

2Aga m achịkọta mba niile ka ha bịa Jerusalem ibuso ya agha. Ha ga-adọta obodo ahụ nʼagha, tụtụkọọ ihe dị nʼụlọ niile, dinaa ndị inyom nʼike. A ga-adọta ọkara ndị bi nʼobodo ahụ nʼagha, duru ha gaa mba ọzọ. Ma ọkara nke ọzọ ka ha ga-ahapụ.

3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-apụ ibuso ndị mba ọzọ ahụ agha, dịka o si ebu agha nʼụbọchị agha.

4Nʼụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo nʼelu Ugwu Oliv, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem. Mgbe ahụ, Ugwu Oliv ga-ekewa abụọ, mee ka ndagwurugwu buru ibu dịrị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Nʼihi ya, ugwu ahụ ga-eke onwe ya abụọ. Otu akụkụ ga-adị nʼugwu, nke ọzọ ga-adị nʼụzọ ndịda.

5Unu ga-esi na ndagwurugwu nke ugwu m ahụ gbalaga, nʼihi na ndagwurugwu ahụ ga-eru Azel. Unu ga-agbapụ dịka unu si gbapụ nʼoge gara aga, mgbe ala ọma jijiji ahụ, nʼoge Uzaya bụ eze Juda. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke m ga-abịa, ya na ndị nsọ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.