18Ọ bụrụ na ndị Ijipt ajụ ịga soro ndị ọzọ ife ofufe ahụ, ha agaghị enweta mmiri ozuzo. Onyenwe anyị ga-eme ka ọrịa ọjọọ ahụ bịakwasị ha, dịka ọ siri bịakwasị mba ndị ahụ niile jụrụ iso mee mmemme ụlọ Ikwu.
19Nke a ga-abụ ahụhụ dịrị ndị Ijipt, na ndị mba dị iche iche, ndị na-agaghị eso na mmemme ụlọ Ikwu ahụ.
20Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-ede nʼahụ ataṅụ nke ịnyịnya niile na-anya nʼolu ha bụ nke a: “Ihe dị Nsọ nye Onyenwe anyị.” Ite niile e ji esi nri dị nʼụlọ nke Onyenwe anyị ga-adị ka efere nsọ ndị ahụ dị nʼihu ebe ịchụ aja.
21Ite niile dị na Juda, na nʼime Jerusalem ga-adị nsọ nye Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ndị niile bịara ịchụ aja ga-ewere ụfọdụ nʼime ite ndị a sie nri ịchụ aja ha. Nʼụbọchị ahụ kwa, a gaghị ahụ kwa ndị na-atụ mgbereahịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.