Zekaraya 6

Ndị nọ nʼebe dị anya ga-esi ebe ahụ bịa nye aka nʼọrụ iwu ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Unu ga-amatakwa na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu. Ihe ndị a niile ga-eme ma ọ bụrụ na unu akpachapụ anya rubere Onyenwe anyị Chineke unu isi.”

Zechariah 6:15 (UKJV) And they that are far off shall come and build in the temple of the LORD, and all of you shall know that the LORD of hosts has sent me unto you. And this shall come to pass, if all of you will diligently obey the voice of the LORD your God.

13Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’

14Okpueze ahụ ka a ga-enye Heldaya, Tobaija, Jedaya na Hen, nwa Zefanaya, ka ọ bụrụ ihe ncheta nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.

15Ndị nọ nʼebe dị anya ga-esi ebe ahụ bịa nye aka nʼọrụ iwu ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Unu ga-amatakwa na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu. Ihe ndị a niile ga-eme ma ọ bụrụ na unu akpachapụ anya rubere Onyenwe anyị Chineke unu isi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.