Zekaraya 6

Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Zechariah 6:9 (UKJV) And the word of the LORD came unto me, saying,

7Mgbe ịnyịnya ndị ahụ dị ike pụtara, chọọ ka e nye ha ike ijegharị nʼụwa niile, ọ gwara ha sị, “Gaanụ jegharịa nʼụwa niile.” Nʼihi ya, ha pụrụ jegharịa nʼụwa niile.

8Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Ndị ahụ jere nʼakụkụ ugwu emeela ka Mmụọ m dajụọ nʼala dị nʼakụkụ ugwu.”

9Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

10“Gaa nata Heldai, Tobaija na Jedaya, ndị a dọtara nʼagha si Babilọn lọta ọlaọcha na ọlaedo. Nʼotu ụbọchị ahụ, gakwaa nʼụlọ Josaya nwa Zefanaya.

11Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.