Zekaraya 6

“Gaa nata Heldai, Tobaija na Jedaya, ndị a dọtara nʼagha si Babilọn lọta ọlaọcha na ọlaedo. Nʼotu ụbọchị ahụ, gakwaa nʼụlọ Josaya nwa Zefanaya.

Zechariah 6:10 (UKJV) Take of them of the captivity, even of Heldai, of Tobijah, and of Jedaiah, which are come from Babylon, and come you the same day, and go into the house of Josiah the son of Zephaniah;

8Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Ndị ahụ jere nʼakụkụ ugwu emeela ka Mmụọ m dajụọ nʼala dị nʼakụkụ ugwu.”

9Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

10“Gaa nata Heldai, Tobaija na Jedaya, ndị a dọtara nʼagha si Babilọn lọta ọlaọcha na ọlaedo. Nʼotu ụbọchị ahụ, gakwaa nʼụlọ Josaya nwa Zefanaya.

11Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi.

12Gwa ya na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nke a bụ nwoke ahụ aha ya bụ Ngalaba. Ọ ga-esi nʼebe nke ya wapụta wuo ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.