Zekaraya 6

Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi.

Zechariah 6:11 (UKJV) Then take silver and gold, and make crowns, and set them upon the head of Joshua the son of Josedech, the high priest;

9Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

10“Gaa nata Heldai, Tobaija na Jedaya, ndị a dọtara nʼagha si Babilọn lọta ọlaọcha na ọlaedo. Nʼotu ụbọchị ahụ, gakwaa nʼụlọ Josaya nwa Zefanaya.

11Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi.

12Gwa ya na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nke a bụ nwoke ahụ aha ya bụ Ngalaba. Ọ ga-esi nʼebe nke ya wapụta wuo ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.

13Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.