9Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ka aka unu sie ike, ka enwe ike wuo ụlọnsọ a, unu ndị na-anụ ugbu a otu okwu ahụ, nke ndị amụma kwuru mgbe a tọrọ ntọala iwugharị ụlọnsọ m, bụ ụlọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
10Tupu ụbọchị ahụ, akwụbeghị ma ndị mmadụ ma ụmụ anụmanụ ụgwọ ọrụ ha. Ọ dịghịkwa udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼihi ndị iro ya, ebe m mere ka onye ọbụla bụrụ onye na-emegide ibe ya.
11Ma ugbu a, agaghị m emeso ndị fọdụrụ nʼala a, dịka m si meso ha nʼoge gara aga.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
12“Nʼihi na mkpụrụ ga-eto nke ọma, osisi vaịnị ga-amị mkpụrụ ya, ala ubi ga-ewepụtakwa ihe omume, igirigi eluigwe ga-ezokwasịkwa ala. Ihe ndị a niile ka m ga-enye ndị fọdụrụ nʼala a ka ọ bụụrụ ha ihe nketa.
13Dịka unu bụ Juda na Izrel si bụrụ ihe a na-abụ ọnụ nʼetiti mba dị iche iche, otu a ka m ga-esi zọpụta unu, unu ga-abụkwa ngọzị. Unu atụla ụjọ, kama meenụ ka aka unu sie ike nʼọrụ unu.”