13Dịka unu bụ Juda na Izrel si bụrụ ihe a na-abụ ọnụ nʼetiti mba dị iche iche, otu a ka m ga-esi zọpụta unu, unu ga-abụkwa ngọzị. Unu atụla ụjọ, kama meenụ ka aka unu sie ike nʼọrụ unu.”
14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Dịka m si kpebie ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu, na dịka m na-egosighị ebere nʼahụ nna nna unu ha mgbe ha kpasuru m iwe,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu,
15“otu a ka m kpebikwara ọzọ nʼụbọchị ndị a imere Jerusalem na Juda ihe ọma. Unu atụla ụjọ.
16Ihe ndị a ka unu ga-eme: Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, kpeenụ ikpe eziokwu nʼụlọikpe unu, nke a na-eweta udo.
17Unu echela echiche ọjọọ megide ibe unu; unu ahụla ịṅụ iyi ụgha nʼanya. Ihe ndị a niile ka m kpọrọ asị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.