15“otu a ka m kpebikwara ọzọ nʼụbọchị ndị a imere Jerusalem na Juda ihe ọma. Unu atụla ụjọ.
16Ihe ndị a ka unu ga-eme: Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, kpeenụ ikpe eziokwu nʼụlọikpe unu, nke a na-eweta udo.
17Unu echela echiche ọjọọ megide ibe unu; unu ahụla ịṅụ iyi ụgha nʼanya. Ihe ndị a niile ka m kpọrọ asị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
18Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị,
19Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu: “Ibu ọnụ unu na-ebu nʼọnwa nke anọ, ọnwa nke ise, ọnwa nke asaa na nʼọnwa nke iri ga-aghọrọ unu oge ịṅụrị ọṅụ na oge obi ụtọ. Ha ga-abụrụ Juda mmemme obi ụtọ. Nʼihi ya, hụnụ eziokwu na udo nʼanya.”