Zekaraya 8

Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị,

Zechariah 8:18 (UKJV) And the word of the LORD of hosts came unto me, saying,

16Ihe ndị a ka unu ga-eme: Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, kpeenụ ikpe eziokwu nʼụlọikpe unu, nke a na-eweta udo.

17Unu echela echiche ọjọọ megide ibe unu; unu ahụla ịṅụ iyi ụgha nʼanya. Ihe ndị a niile ka m kpọrọ asị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

18Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị,

19Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu: “Ibu ọnụ unu na-ebu nʼọnwa nke anọ, ọnwa nke ise, ọnwa nke asaa na nʼọnwa nke iri ga-aghọrọ unu oge ịṅụrị ọṅụ na oge obi ụtọ. Ha ga-abụrụ Juda mmemme obi ụtọ. Nʼihi ya, hụnụ eziokwu na udo nʼanya.”

20Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwukwa: “Ndị dị iche iche na ndị bi nʼọtụtụ obodo dị iche iche ka ga-abịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.