5Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme. Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu. Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla. A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya. Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.
6Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd, aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị.
7Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha, wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya. Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị, ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda. Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus.
8Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche, ka ndị iro ghara ịbata na ya. Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha, nʼihi na anọ m na nche ugbu a.
9Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn! Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem! Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị, onye ezi omume na onye nwere mmeri, onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.