Zefanaya 1

Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị azọpụta ha nʼụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị ahụ.” A ga-erechapụ ụwa niile site nʼọkụ ekworo ya, nʼihi na ọ bụ na mberede ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.

Zephaniah 1:18 (UKJV) Neither their silver nor their gold shall be able to deliver them in the day of the LORD's wrath; but the whole land shall be devoured by the fire of his jealousy: for he shall make even a speedy purging of all them that dwell in the land.

16ụbọchị opi ike na iti mkpu agha imegide obodo niile e wusiri ike, na imegide akụkụ ụlọ elu niile.

17“Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ, mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì, nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị. A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu, tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ.

18Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị azọpụta ha nʼụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị ahụ.” A ga-erechapụ ụwa niile site nʼọkụ ekworo ya, nʼihi na ọ bụ na mberede ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.