5bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando, ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi, ma na-ejikwa Milkọm na-aṅụ iyi,
6na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.”
7Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso. Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja; o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ.
8“Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ, aga m ata ndịisi niile na ụmụ eze niile, na ndị niile na-eyi uwe e si na mba ọzọ bubata ahụhụ.
9Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụ bụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata, ndị ji ihe ike na aghụghọ na-emejupụta ụlọ arụsị ha.