3Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ, unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu. Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi, ma eleghị anya, a ga-echebe unu nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị.
4Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza, obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu. Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd; a ga-ehopukwa Ekrọn.
5Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri, unu bụ ndị Keret; okwu Onyenwe anyị na-emegide unu, Kenan, ala ndị Filistia. Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi, ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.”
6Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ, ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ na ọgba igwe ewu na atụrụ.
7Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda, ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa. Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu, dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi. Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha, mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile.