Zefanaya 2

Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ, unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu. Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi, ma eleghị anya, a ga-echebe unu nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị.

Zephaniah 2:3 (UKJV) Seek all of you the LORD, all you meek of the earth, which have wrought his judgment; seek righteousness, seek meekness: it may be all of you shall be hid in the day of the LORD's anger.

1Chịkọtaanụ onwe unu, e, chịkọtaanụ onwe unu, unu ndị mba ihe ihere dịrị.

2Tupu ụkpụrụ ahụ ewere ọnọdụ, a chịpụ ụbọchị ahụ dịka igbugbo ọka nke ikuku na-ebufu, tupu iwe ọkụ Onyenwe anyị abịakwasị gị, tupu ụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị abịakwasị gị.

3Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ, unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu. Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi, ma eleghị anya, a ga-echebe unu nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị.

4Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza, obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu. Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd; a ga-ehopukwa Ekrọn.

5Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri, unu bụ ndị Keret; okwu Onyenwe anyị na-emegide unu, Kenan, ala ndị Filistia. Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi, ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.