Zefanaya 3

Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa nʼaha Onyenwe anyị.

Zephaniah 3:12 (UKJV) I will also leave in the midst of you an afflicted and poor people, and they shall trust in the name of the LORD.

10Site nʼofe osimiri niile nke Kush, bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche.

11Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị, nʼihi omume njehie niile i jere megide m, nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile na-aṅụrị ọṅụ na mpako ha. A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu nʼugwu nsọ m.

12Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa nʼaha Onyenwe anyị.

13Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ, ha agaghị ekwu okwu ụgha. Ire na-ekwu okwu aghụghọ agaghị adịkwa nʼọnụ ha. Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.”

14Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.