12Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa nʼaha Onyenwe anyị.
13Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ, ha agaghị ekwu okwu ụgha. Ire na-ekwu okwu aghụghọ agaghị adịkwa nʼọnụ ha. Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.”
14Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem.
15Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ.
16Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba.