14Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem.
15Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ.
16Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba.
17Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba, kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”
18“Nʼụbọchị mmemme a kara aka, aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ, nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị.