18“Nʼụbọchị mmemme a kara aka, aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ, nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị.
19Nʼoge ahụ, aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike. Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ, chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ. Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.
20Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ; mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ. Aga m eme ka unu na-ewu ewu ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa, mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu nʼihu anya unu.” Ka Onyenwe anyị kwuru.