Zefanaya 3

Asịrị m, banyere Jerusalem, ‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m, ma nabatakwa ntụziaka.’ Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya, ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya. Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere.

Zephaniah 3:7 (UKJV) I said, Surely you will fear me, you will receive instruction; so their dwelling should not be cut off, howsoever I punished them: but they rose early, and corrupted all their doings.

5Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume. Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ. Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè; ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya, ma ndị ajọ omume enweghị ihere.

6“Egbuchapụla m mba niile dị iche iche, kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike. Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ, ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga. A laala obodo ha niile nʼiyi, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.

7Asịrị m, banyere Jerusalem, ‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m, ma nabatakwa ntụziaka.’ Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya, ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya. Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere.

8Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe. Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche, na ịkpọkọta alaeze niile, ịwụkwasị ha oke iwe m, ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m. Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m, ka a ga-eji rechapụ ụwa niile.

9“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.