1 Ihe E Mere 15

Ya mere, Devid kpọkọtara ndị Izrel niile, na Jerusalem ibubata igbe Onyenwe anyị nʼebe ahụ ọ kwadoro na a ga-adọsa ya.

1 Chronicles 15:3 (UKJV) And David gathered all Israel together to Jerusalem, to bring up the ark of the LORD unto his place, which he had prepared for it.

1Mgbe Devid wuchara ụlọ obibi ya nʼobodo Devid, o doziri ebe a ga-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ọ mara ụlọ ikwu maka ya.

2Devid kwuru sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ebu igbe Chineke karịakwa ndị Livayị, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara ha ibu igbe Onyenwe anyị na ije ozi nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”

3Ya mere, Devid kpọkọtara ndị Izrel niile, na Jerusalem ibubata igbe Onyenwe anyị nʼebe ahụ ọ kwadoro na a ga-adọsa ya.

4Ọ kpọkọtara ụmụ Erọn na ndị Livayị:

5Ndị Kohat na ụmụnna ha dị otu narị na iri abụọ. (120) Uriel bụ onyeisi ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.