20Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa na alaeze ọzọ.
21O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha, sị:
22“Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka, unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
23Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
24Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.