1 Ihe E Mere 2

Juda mụtara ụmụ ndị ikom atọ site na nwunye ya Bat-shua, onye Kenan. Aha ha bụ Ịa, Onan na Shela. Ma Ịa ọkpara Juda bụ nnọọ mmadụ ọjọọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi ya, Onyenwe anyị gburu ya.

1 Chronicles 2:3 (UKJV) The sons of Judah; Er, and Onan, and Shelah: which three were born unto him of the daughter of Shua the Canaanitess. And Er, the firstborn of Judah, was evil in the sight of the LORD; and he slew him.

1Izrel mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a: Ruben, Simiọn, Livayị, Juda, Isaka, na Zebụlọn,

2Dan, Josef, Benjamin, Naftalị, Gad na Asha.

3Juda mụtara ụmụ ndị ikom atọ site na nwunye ya Bat-shua, onye Kenan. Aha ha bụ Ịa, Onan na Shela. Ma Ịa ọkpara Juda bụ nnọọ mmadụ ọjọọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi ya, Onyenwe anyị gburu ya.

4Juda mụtakwara ụmụ nwoke abụọ ọzọ, Perez na Zera, site na Tama nwunye nwa ya nwoke. Ụmụ ndị nwoke niile Juda dị ise.

5Ụmụ ndị ikom Perez bụ, Hezrọn na Hamul.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.