28Mgbe Devid hụrụ na Onyenwe anyị azala ekpere ya nʼebe ịzọcha ọka nke Arauna onye Jebus, ọ chụkwara aja ọzọ nye Onyenwe anyị.
29Ụlọ ikwu Onyenwe anyị na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ Mosis wuru nʼọzara dị nʼebe dị elu Gibiọn, nʼoge ahụ.
30Ma Devid ejerughị ebe ahụ ịjụta Chineke ase, nʼihi na ụjọ tụrụ ya mgbe ọ hụrụ mma agha ahụ dị nʼaka mmụọ ozi Onyenwe anyị.