1 Ihe E Mere 22

Mgbe ahụ, Devid sịrị, “Ebe a ka a ga-ewuru Onyenwe anyị Chineke ụlọ, nakwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Izrel.”

1 Chronicles 22:1 (UKJV) Then David said, This is the house of the LORD God, and this is the altar of the burnt offering for Israel.

1Mgbe ahụ, Devid sịrị, “Ebe a ka a ga-ewuru Onyenwe anyị Chineke ụlọ, nakwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Izrel.”

2Ya mere, Devid nyere iwu ka a kpọkọta ndị ọbịa niile bi nʼIzrel, site nʼetiti ha ọ họpụtara ndị ga-edozi nkume a wara awa nke e ji wuo ụlọ Chineke.

3Devid wetara ọtụtụ igwe dị ukwuu, nke ha ji akpụta ǹtu maka ibo ọnụ ụzọ ama niile, na nke ịkpụ ihe njikọta niile. O wetakwara bronz a na-apụghị ịkọwa ịdị arọ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.