1 Ihe E Mere 22

Ya mere, Devid nyere iwu ka a kpọkọta ndị ọbịa niile bi nʼIzrel, site nʼetiti ha ọ họpụtara ndị ga-edozi nkume a wara awa nke e ji wuo ụlọ Chineke.

1 Chronicles 22:2 (UKJV) And David commanded to gather together the strangers that were in the land of Israel; and he set stone workers to hew wrought stones to build the house of God.

1Mgbe ahụ, Devid sịrị, “Ebe a ka a ga-ewuru Onyenwe anyị Chineke ụlọ, nakwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Izrel.”

2Ya mere, Devid nyere iwu ka a kpọkọta ndị ọbịa niile bi nʼIzrel, site nʼetiti ha ọ họpụtara ndị ga-edozi nkume a wara awa nke e ji wuo ụlọ Chineke.

3Devid wetara ọtụtụ igwe dị ukwuu, nke ha ji akpụta ǹtu maka ibo ọnụ ụzọ ama niile, na nke ịkpụ ihe njikọta niile. O wetakwara bronz a na-apụghị ịkọwa ịdị arọ ya.

4O webatakwara osisi sida nʼapụghị ịgụta ọnụọgụgụ ha, nʼihi na ndị Taịa na Saịdọn butere ha nʼọnụọgụgụ riri nne nye Devid.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.