6Ọ kpọrọ Solomọn, bụ nwa ya, nye ya iwu iwuru Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel ụlọ.
7Devid gwara Solomọn sị, “Nwa m, ọ dị m nʼobi iwu ụlọ maka aha Onyenwe anyị bụ Chineke m,
8ma okwu Onyenwe anyị ndị a ruru m ntị sị m, ‘Ị wụsịala ọtụtụ ọbara, bukwaa ọtụtụ agha. Ị gaghị ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị wụsịala ọtụtụ ọbara nʼelu ala nʼihu m.
9Ma ị ga-amụta otu nwa nwoke onye ga-abụ mmadụ udo, na onye ga-enwe izuike nʼoge ya. Aga m enye ya izuike site nʼaka ndị iro ya nʼakụkụ niile. Aha ya ga-abụ Solomọn. Aga m enye Izrel udo na ahụ dị jụụ nʼoge ọchịchị ya.
10Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’