25A họpụtara nwanne Maịka nke nwoke aha ya bụ Ishaya, sitekwa nʼụmụ Ishaya họpụta Zekaraya.
26Site nʼụmụ Merari e nwere Mahali na Mushi. A họpụtakwara Beno nwa Jaazia.
27Sitekwa nʼụmụ Merari a họpụtara ụmụ Jaazia ndị a: Beno, Shoham, Zakua na Ibri.
28Site nʼụmụ Mahali a họpụtara Elieza, ma Elieza nʼonwe ya amụtaghị nwa nwoke.
29Site nʼụmụ Kish a họpụtara Jerameel.