27Sitekwa nʼụmụ Merari a họpụtara ụmụ Jaazia ndị a: Beno, Shoham, Zakua na Ibri.
28Site nʼụmụ Mahali a họpụtara Elieza, ma Elieza nʼonwe ya amụtaghị nwa nwoke.
29Site nʼụmụ Kish a họpụtara Jerameel.
30Site nʼụmụ Mushi, a họpụtara Mahali, na Eda na Jerimot. Ndị a niile bụ ndị Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị.
31Dịka e mere mgbe a na-ahọpụta ụmụ Erọn, e ji ife nza kenye ha niile ọrụ ha kwesiri ịrụ nʼotu nʼotu, onye ukwu ha na onye nta ha. E mere ya nʼihu eze Devid, na Zadọk, na Ahimelek, na ndịisi ezinaụlọ ndị nchụaja na ndị Livayị niile. Mgbe a na-efe nza a, e mesoro ndị ikom niile otu mmeso, ma okenye ha ma ndị na-etolite etolite.