1 Ihe E Mere 25

Ma nye Jedutun, ụmụ ndị ikom ya: Gedaliya, Zeri, Jeshaya, Shimei, Hashabaya na Matitaia. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ nọrọ nʼokpuru nna ha bụ Jedutun, onye na-ebu amụma, na-eji une na-enye Onyenwe anyị ekele na otuto.

1 Chronicles 25:3 (UKJV) Of Jeduthun: the sons of Jeduthun; Gedaliah, and Zeri, and Jeshaiah, Hashabiah, and Mattithiah, six, under the hands of their father Jeduthun, who prophesied with a harp, to give thanks and to praise the LORD.

1Devid na ndịisi agha ndị Izrel họpụtara ndị ga na-ebu amụma mgbe ndị ji ụbọ akwara, une na ogene na-eti egwu. Ha sitere nʼụmụ Asaf, Heman na Jedutun, họpụta ha. Ndị a bụ aha ndị rụrụ ọrụ nke a:

2Ndị amụma na-ebu amụma, ndị nke bụ ụmụ Asaf: Zakua, Josef, Netanaya na Asarela bụ ụmụ Asaf nọ nʼokpuru Asaf, onye nọ nʼokpuru eze bụ onyeisi ha.

3Ma nye Jedutun, ụmụ ndị ikom ya: Gedaliya, Zeri, Jeshaya, Shimei, Hashabaya na Matitaia. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ nọrọ nʼokpuru nna ha bụ Jedutun, onye na-ebu amụma, na-eji une na-enye Onyenwe anyị ekele na otuto.

4Ma nye Heman, ụmụ ndị ikom ya: Bukaya, Matanaya, Uziel, Shubuel, Jerimot, Hananaya, Hanani, Eliata, Gidalti, Romamti-Eza, Joshbekasha, Maloti, Hotia, na Mahaziot.

5Ndị a niile bụ ụmụ Heman, onye bụ ọhụ ụzọ eze. Dịka nkwa Chineke kwere maka ibuli ya elu, Chineke nyere ya ụmụ ndị ikom iri na anọ, na ụmụ ndị inyom atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.