1Devid na ndịisi agha ndị Izrel họpụtara ndị ga na-ebu amụma mgbe ndị ji ụbọ akwara, une na ogene na-eti egwu. Ha sitere nʼụmụ Asaf, Heman na Jedutun, họpụta ha. Ndị a bụ aha ndị rụrụ ọrụ nke a:
2Ndị amụma na-ebu amụma, ndị nke bụ ụmụ Asaf: Zakua, Josef, Netanaya na Asarela bụ ụmụ Asaf nọ nʼokpuru Asaf, onye nọ nʼokpuru eze bụ onyeisi ha.
3Ma nye Jedutun, ụmụ ndị ikom ya: Gedaliya, Zeri, Jeshaya, Shimei, Hashabaya na Matitaia. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ nọrọ nʼokpuru nna ha bụ Jedutun, onye na-ebu amụma, na-eji une na-enye Onyenwe anyị ekele na otuto.