9E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ (18) ndị bụkwa ezi ndị ndu.
10Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom: Shimri onye nke mbụ (ọ bụ ezie na ọ bụghị ọkpara ya ma nna ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbụ).
11Hilkaya, nke abụọ, Tebalaya, nke atọ na Zekaraya onye nke anọ. Ụmụ ndị ikom na ụmụnne Hosa nwere dị iri na atọ (13).
12E kere ndị nche ụlọnsọ ukwu niile nʼotu nʼotu. Otu ndị a nwekwara ndịisi. E kenyekwara otu ọbụla ọrụ dịka e si kenye ụmụnna ha ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
13E sitere nʼife nza kenye ma nwantakịrị ma okenye, ọnụ ụzọ ha ga-eche nche, dịka ezinaụlọ ha si dị.