1 Ihe E Mere 26

E sitere nʼife nza kenye ma nwantakịrị ma okenye, ọnụ ụzọ ha ga-eche nche, dịka ezinaụlọ ha si dị.

1 Chronicles 26:13 (UKJV) And they cast lots, as well the small as the great, according to the house of their fathers, for every gate.

11Hilkaya, nke abụọ, Tebalaya, nke atọ na Zekaraya onye nke anọ. Ụmụ ndị ikom na ụmụnne Hosa nwere dị iri na atọ (13).

12E kere ndị nche ụlọnsọ ukwu niile nʼotu nʼotu. Otu ndị a nwekwara ndịisi. E kenyekwara otu ọbụla ọrụ dịka e si kenye ụmụnna ha ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

13E sitere nʼife nza kenye ma nwantakịrị ma okenye, ọnụ ụzọ ha ga-eche nche, dịka ezinaụlọ ha si dị.

14Site nʼife nza, Shelemaya ketara iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nche. Zekaraya nwa ya, onye ndụmọdụ nwere uche, sitekwara nʼife nza keta iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ugwu, ya na ndị otu ya.

15Obed-Edọm na ndị otu ya na-eche ụzọ dị na ndịda. Ụmụ ya bụ ndị na-eche ụlọ ebe a na-achịkọta ihe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.