1Mgbe ahụ, Devid gwara ọgbakọ Izrel niile okwu sị ha, “Nwa m Solomọn, onye Chineke họpụtara ịbụ eze nʼọnọdụ m, bụ nwantakịrị na-amachabeghị ihe. Ma ọrụ o nwere ịrụ dị ukwuu, nʼihi na ụlọ ukwu a abụghị mmadụ ka ọ dịrị, kama ọ bụ nye Onyenwe anyị Chineke.
2Ma nʼike m niile, agbalịala m wetachaa ihe niile a ga-eji wuo ụlọnsọ ukwu Chineke m ebe ha dị ukwuu: ọlaedo a ga-eji kpụọ ihe ọlaedo niile, ọlaọcha a ga-eji kpụọ ihe ọlaọcha niile, bronz a ga-eji kpụọ ihe bronz niile, igwe a ga-eji kpụọ ihe igwe niile, na osisi a ga-eji rụọ ihe osisi niile, nkume dị oke ọnụahịa ọniks, a ga-ahịọnye ahịọnye, na nkume dị oke ọnụahịa tọkwọisi, na nkume ndị ọzọ ụcha ha dị iche iche, na nkume ndị ọzọ mara mma, tinyere mabụl.
3Ugbu a, nʼihi mmasị m nʼebe ụlọnsọ Chineke m dị, ana m enye akụ nke aka m niile, ya bụ ọlaedo na ọlaọcha m, iji ya nye aka, maka iwu ụlọnsọ ukwu Chineke m. Ihe ndị a ka m na-enye, tụkwasịkwa nʼelu ihe ndị ọzọ niile bụ nke m nyerela, nʼihi ụlọnsọ ukwu a: