1 Ihe E Mere 29

Ugbu a, nʼihi mmasị m nʼebe ụlọnsọ Chineke m dị, ana m enye akụ nke aka m niile, ya bụ ọlaedo na ọlaọcha m, iji ya nye aka, maka iwu ụlọnsọ ukwu Chineke m. Ihe ndị a ka m na-enye, tụkwasịkwa nʼelu ihe ndị ọzọ niile bụ nke m nyerela, nʼihi ụlọnsọ ukwu a:

1 Chronicles 29:3 (UKJV) Moreover, because I have set my affection to the house of my God, I have of mine own proper good, of gold and silver, which I have given to the house of my God, over and above all that I have prepared for the holy house.

1Mgbe ahụ, Devid gwara ọgbakọ Izrel niile okwu sị ha, “Nwa m Solomọn, onye Chineke họpụtara ịbụ eze nʼọnọdụ m, bụ nwantakịrị na-amachabeghị ihe. Ma ọrụ o nwere ịrụ dị ukwuu, nʼihi na ụlọ ukwu a abụghị mmadụ ka ọ dịrị, kama ọ bụ nye Onyenwe anyị Chineke.

2Ma nʼike m niile, agbalịala m wetachaa ihe niile a ga-eji wuo ụlọnsọ ukwu Chineke m ebe ha dị ukwuu: ọlaedo a ga-eji kpụọ ihe ọlaedo niile, ọlaọcha a ga-eji kpụọ ihe ọlaọcha niile, bronz a ga-eji kpụọ ihe bronz niile, igwe a ga-eji kpụọ ihe igwe niile, na osisi a ga-eji rụọ ihe osisi niile, nkume dị oke ọnụahịa ọniks, a ga-ahịọnye ahịọnye, na nkume dị oke ọnụahịa tọkwọisi, na nkume ndị ọzọ ụcha ha dị iche iche, na nkume ndị ọzọ mara mma, tinyere mabụl.

3Ugbu a, nʼihi mmasị m nʼebe ụlọnsọ Chineke m dị, ana m enye akụ nke aka m niile, ya bụ ọlaedo na ọlaọcha m, iji ya nye aka, maka iwu ụlọnsọ ukwu Chineke m. Ihe ndị a ka m na-enye, tụkwasịkwa nʼelu ihe ndị ọzọ niile bụ nke m nyerela, nʼihi ụlọnsọ ukwu a:

4bụ puku talenti ọlaedo atọ (ọlaedo e si Ọfịa bubata), na puku talenti ọlaọcha asaa nke a nụchara anụcha, nke a ga-eji machite ahụ ụlọ niile nke ụlọ ndị ahụ.

5Maka ọrụ niile a ga-eji ọlaedo rụọ, na nke a ga-eji ọlaọcha rụọ, na ọrụ niile ndị ǹka ga-arụ. Ugbu a, onye jikeere iwere onwe ya nyechasịa Onyenwe anyị nʼaka taa?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.