1 Ihe E Mere 29

Maka ọrụ niile a ga-eji ọlaedo rụọ, na nke a ga-eji ọlaọcha rụọ, na ọrụ niile ndị ǹka ga-arụ. Ugbu a, onye jikeere iwere onwe ya nyechasịa Onyenwe anyị nʼaka taa?”

1 Chronicles 29:5 (UKJV) The gold for things of gold, and the silver for things of silver, and for all manner of work to be made by the hands of artificers. And who then is willing to consecrate his service this day unto the LORD?

3Ugbu a, nʼihi mmasị m nʼebe ụlọnsọ Chineke m dị, ana m enye akụ nke aka m niile, ya bụ ọlaedo na ọlaọcha m, iji ya nye aka, maka iwu ụlọnsọ ukwu Chineke m. Ihe ndị a ka m na-enye, tụkwasịkwa nʼelu ihe ndị ọzọ niile bụ nke m nyerela, nʼihi ụlọnsọ ukwu a:

4bụ puku talenti ọlaedo atọ (ọlaedo e si Ọfịa bubata), na puku talenti ọlaọcha asaa nke a nụchara anụcha, nke a ga-eji machite ahụ ụlọ niile nke ụlọ ndị ahụ.

5Maka ọrụ niile a ga-eji ọlaedo rụọ, na nke a ga-eji ọlaọcha rụọ, na ọrụ niile ndị ǹka ga-arụ. Ugbu a, onye jikeere iwere onwe ya nyechasịa Onyenwe anyị nʼaka taa?”

6Mgbe ahụ, ndịisi ezinaụlọ, na ndịisi ozi nke ebo Izrel niile, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi na-elekọta ọrụ eze, jiri obi ha niile nye onyinye.

7Ha nyere maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke. Ha nyere puku talenti ọlaedo ise, na puku darik ọlaedo iri, nyekwa puku talenti ọlaọcha iri, na puku talenti bronz iri na asatọ, na narị puku talenti igwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.