1 Ihe E Mere 29

Ya mere, gị Onyenwe anyị, Chineke nna anyị Ebraham na Aịzik, na Izrel, biko, mee ka ụdị ọchịchọ a dịgide nʼime obi ndị gị ruo ebighị ebi, meekwa ka ha jiri obi ha niile gbasoo gị mgbe niile.

1 Chronicles 29:18 (UKJV) O LORD God of Abraham, Isaac, and of Israel, our fathers, keep this for ever in the imagination of the thoughts of the heart of your people, and prepare their heart unto you:

16O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ihe niile ndị a anyị bukọrọ maka iji rụọra gị ụlọnsọ si nʼaka gị bịa. Ha niile bụkwa nke gị.

17Amaara m, Chineke m, na ị na-anwale obi, na i na-enwekwa mmasị nʼihe ziri ezi. Ihe ndị niile ka m onwe m nyere site nʼafọ ofufu nakwa obi ziri ezi. Ma ugbu a, ahụla m ọṅụ ndị gị, bụ ndị nọ nʼebe a, ji were afọ ofufu nye gị onyinye ha.

18Ya mere, gị Onyenwe anyị, Chineke nna anyị Ebraham na Aịzik, na Izrel, biko, mee ka ụdị ọchịchọ a dịgide nʼime obi ndị gị ruo ebighị ebi, meekwa ka ha jiri obi ha niile gbasoo gị mgbe niile.

19Nye nwa m Solomọn obi zuruoke nke ọ ga-eji debe iwu gị niile, ọchịchọ gị niile na ụkpụrụ gị niile, ya na mmụọ imezu ihe niile metụtara owuwu ụlọnsọ ukwu a nke m kwadooro ihe niile ndị a.”

20Mgbe ahụ, Devid gwara ndị Izrel okwu sị, “Toonu Onyenwe anyị Chineke unu!” Ha niile toro Onyenwe anyị Chineke nna ha, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị na eze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.