1 Ihe E Mere 29

Onyenwe anyị mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula.

1 Chronicles 29:25 (UKJV) And the LORD magnified Solomon exceedingly in the sight of all Israel, and bestowed upon him such royal majesty as had not been on any king before him in Israel.

23Ya mere, Solomọn nọkwasịrị nʼocheeze Onyenwe anyị dịka eze, nʼọnọdụ nna ya Devid. Ọ bara ụba nke ukwuu. Ndị Izrel rubekwaara ya isi.

24Ndịisi ọchịchị niile, na ndịisi Izrel niile, na ụmụ ndị ikom eze Devid niile kwupụtara nrube isi ha nye Solomọn, eze ọhụrụ.

25Onyenwe anyị mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula.

26Devid nwa Jesi bụ eze ndị Izrel niile.

27Ọ chịrị Izrel iri afọ anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.