1 Ihe E Mere 29

Ọ chịrị Izrel iri afọ anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.

1 Chronicles 29:27 (UKJV) And the time that he reigned over Israel was forty years; seven years reigned he in Hebron, and thirty and three years reigned he in Jerusalem.

25Onyenwe anyị mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula.

26Devid nwa Jesi bụ eze ndị Izrel niile.

27Ọ chịrị Izrel iri afọ anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.

28Ọ nwụrụ mgbe ọ ghọrọ ezigbo agadi. Ọ bụkwa onye biri ogologo ndụ, onye nwekwara akụnụba na nsọpụrụ. Solomọn nwa ya nwoke nọchiri ya dịka eze.

29Ihe niile gbasara ọchịchị eze Devid, site na mmalite rụọ nʼọgwụgwụ, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ Samuel, onye ọhụ ụzọ, na nʼakwụkwọ Netan, onye amụma, na nʼakwụkwọ Gad onye ọhụ ụzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.