1 Ihe E Mere 29

Ọ nwụrụ mgbe ọ ghọrọ ezigbo agadi. Ọ bụkwa onye biri ogologo ndụ, onye nwekwara akụnụba na nsọpụrụ. Solomọn nwa ya nwoke nọchiri ya dịka eze.

1 Chronicles 29:28 (UKJV) And he died in a good old age, full of days, riches, and honour: and Solomon his son reigned in his position.

26Devid nwa Jesi bụ eze ndị Izrel niile.

27Ọ chịrị Izrel iri afọ anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.

28Ọ nwụrụ mgbe ọ ghọrọ ezigbo agadi. Ọ bụkwa onye biri ogologo ndụ, onye nwekwara akụnụba na nsọpụrụ. Solomọn nwa ya nwoke nọchiri ya dịka eze.

29Ihe niile gbasara ọchịchị eze Devid, site na mmalite rụọ nʼọgwụgwụ, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ Samuel, onye ọhụ ụzọ, na nʼakwụkwọ Netan, onye amụma, na nʼakwụkwọ Gad onye ọhụ ụzọ.

30Akụkọ ndị a gosiri ihe gbasara ọchịchị eze ya, na ịdị ike ya, na ihe niile mere ya, na ihe mere ndị Izrel, na ndị eze ndị mba ọzọ bi ha gburugburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.