19Shalum bụ nwa Kore, na nwa nwa Ebiasaf na Kora. Ya na ụmụnna ya ka ọ bụ ọrụ ha ilekọta ebe a na-eje ozi, na ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ dịka nna nna ha lekọtara, cheekwa ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
20Finehaz nwa Elieza bụ onyeisi ndị mbụ rụrụ ọrụ a na mgbe ochie, Onyenwe anyị nọnyekwaara ya.
21Mgbe ahụ, Zekaraya nwa Meshelemaia bụ onye na-elekọta ọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ ikwu.
22Ọnụọgụgụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nche nʼoge ahụ bụ narị abụọ na iri na abụọ (212). E depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nke obodo nta ha. Ndị nche ọnụ ụzọ ama ndị a bụ ndị Devid na Samuel onye amụma họpụtara nye ha ọnọdụ a nʼihi na-atụkwasịrị ha obi.
23Ha na ụmụ ụmụ ha ka e tinyere ya nʼaka iche ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.