1Abụghị m onye nwe onwe ya? Abụghị m onyeozi Kraịst? Ọ bụ na m ahụghị Jisọs Onyenwe anyị? Unu abụghị ihe ngosipụta ọrụ m rụrụ nʼime Onyenwe anyị?
2Ọ bụrụ na m abụghị onyeozi nʼebe ndị ọzọ nọ, nʼebe unu nọ, abụ m onyeozi nʼeziokwu nʼihi na unu bụ akara nke ọrụ onyeozi m nʼime Onyenwe anyị.
3Ihe ngọpụ m nye ndị ahụ na-enyocha m bụ nke a.
4Ọ bụ na anyị enweghị ike iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ?
5Ọ bụ na anyị enweghị ike iduru nwunye onye bụ onye kwere ekwe gaa ebe ọbụla anyị na-aga dịka ndị ozi ọzọ na-eme, na dịka ụmụnne Onyenwe anyị na Sefas na-emekwa?