9Ma ihe ọjọọ i mere adịla ukwuu karịa nke ndị niile bu gị ụzọ bụrụ eze mere. Ị kpụọlara onwe gị chi ndị ọzọ, chi ndị e ji ọla kpụọ, si otu a kpasuo m iwe, gbakụta m azụ gị.
10“ ‘Nʼihi ihe ndị a, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ezinaụlọ Jeroboam. Aga m ekpochapụkwa ụmụ ndị ikom gị niile, ma ndị ohu, ma ndị nwe onwe ha nọ nʼala Izrel. Aga m ekpochapụkwa ụlọ Jeroboam dịka mmadụ si ekpochapụ nsị anụ, ruo mgbe e kpochapụrụ ha niile.
11Nkịta ga-eri ozu ndị nke Jeroboam ndị nwụrụ nʼime obodo, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha. Onyenwe anyị ekwuola ya.’
12“Ma gị onwe gị, Laa nʼụlọ gị. Mgbe ị na-azọbanye ụkwụ gị nʼobodo, nwokorobịa ahụ ga-anwụ.
13Ndị Izrel niile ga-akwa akwa nʼihi ya lie ya. Ọ bụ naanị ya bụ onye a ga-eli eli, nʼihi na nʼime ezinaụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị nʼime nwokorobịa a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel chọtara ihe dị mma.