1 Ndị Eze 14

Ndị Izrel niile ga-akwa akwa nʼihi ya lie ya. Ọ bụ naanị ya bụ onye a ga-eli eli, nʼihi na nʼime ezinaụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị nʼime nwokorobịa a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel chọtara ihe dị mma.

1 Kings 14:13 (UKJV) And all Israel shall mourn for him, and bury him: for he only of Jeroboam shall come to the grave, because in him there is found some good thing toward the LORD God of Israel in the house of Jeroboam.

11Nkịta ga-eri ozu ndị nke Jeroboam ndị nwụrụ nʼime obodo, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha. Onyenwe anyị ekwuola ya.’

12“Ma gị onwe gị, Laa nʼụlọ gị. Mgbe ị na-azọbanye ụkwụ gị nʼobodo, nwokorobịa ahụ ga-anwụ.

13Ndị Izrel niile ga-akwa akwa nʼihi ya lie ya. Ọ bụ naanị ya bụ onye a ga-eli eli, nʼihi na nʼime ezinaụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị nʼime nwokorobịa a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel chọtara ihe dị mma.

14“Ma Onyenwe anyị ga-emekwa ka eze ọzọ bilie nʼIzrel, onye ga-ekpochapụ ezinaụlọ Jeroboam niile. O bidola taa, e, ma ugbu a kwa!

15Onyenwe anyị ga-eti Izrel ihe, mee ka ọ maa jijiji dịka osisi achara nke ikuku na-ebugharị nʼime mmiri. Ọ ga-ehopu Izrel site nʼezi ala o nyere nna nna ha, fesaa ha nʼofe osimiri Yufretis, nʼihi na ha akpasuola iwe Onyenwe anyị site nʼiguzobe ogidi ofufe Ashera.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.