1 Ndị Eze 17

Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Onyenwe anyị Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?”

1 Kings 17:20 (UKJV) And he cried unto the LORD, and said, O LORD my God, have you also brought evil upon the widow with whom I sojourn, by slaying her son?

18Mgbe ahụ, nwanyị ahụ kwaara akwa bịakwute Ịlaịja sị ya, “Ewoo, onye nke Chineke, gịnị ka i nwere megide m? Ị bịara ka i chetara m mmehie m, na igbu nwa m nwoke?”

19Ịlaịja zara sị ya, “Kunye m nwa gị nwoke.” Ịlaịja kuuru ya site nʼaka nne ya rigoo nʼụlọ elu ebe ya onwe ya na-edina, nibe ya nʼelu ihe ndina ya.

20Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Onyenwe anyị Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?”

21Ịlaịja gbatịrị onwe ya nʼahụ nwantakịrị ahụ ugboro atọ, kpọkuo Onyenwe anyị, sị, “Biko, Onyenwe anyị Chineke m, kwere ka mkpụrụobi nwantakịrị a laghachikwute ya.”

22Onyenwe anyị nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.