1 Ndị Eze 17

Onyenwe anyị nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ.

1 Kings 17:22 (UKJV) And the LORD heard the voice of Elijah; and the soul of the child came into him again, and he revived.

20Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Onyenwe anyị Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?”

21Ịlaịja gbatịrị onwe ya nʼahụ nwantakịrị ahụ ugboro atọ, kpọkuo Onyenwe anyị, sị, “Biko, Onyenwe anyị Chineke m, kwere ka mkpụrụobi nwantakịrị a laghachikwute ya.”

22Onyenwe anyị nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ.

23Mgbe ahụ, Ịlaịja kuuru ya si nʼụlọ elu ahụ rịdata, kunye ya nne ya, gwa ya okwu sị, “Lee, nwa gị dị ndụ!”

24Nwanyị ahụ sịrị Ịlaịja, “Ugbu a, amatala m na ị bụ onye nke chineke, na okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ gị apụta bụ eziokwu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.